Ụlọ ọrụ onye-isi ala ekwela Naijiria nkwa maka ahụ-ike Presdenti Buhari

2
48

Ụlọ ọrụ onye-isi ala agwala ndi Naijiria, na agbanyeghi ahụ-ike onye-isi ala n’ihe gana aga etu okwesiri.site n’okwu a, onye-isi ala anaghi aga ọgbakọ bụ site na ndụm ọdụ dibia oyibo ya.
“Na Presidenti Buhari anọghi na nzukọ ndi isi ọrụ na ụbọchi iri abụọ na isii nke ọnwa anọ,bụ mkpebi ngwucha oge ,ewezuga ya aga eme ka ndi mmadu mata.dibia oyibo onye-isi ala agwala ya ka owere ihe nile nwayọ,dika ọna agbake n’ọria izu ụka ole n’ole gara aga nke o gara nata ọgwugwọ na mba United Kingdom,” dika okwu a si kọwa.
O kwuru na mgbe onye-isi ala si London lọta Naijiria,na omere ka ndi Naijiria mata ọnọdu ahụ-ike ya,ma kwuo na-ọga ewe obere oge iji gbakecha n’ọria nke chọrọ obere ezum-ike.
Ndi Naijiria ga aghọta na Presidenti Buhari ahapubeghi ọrụ ya dika onye-isi ala,ana agwakwa ya ihe nile n’eme na ogige gọọmenti ma ọna ahukwa osote onye-isi ala bụ okammuta Yemi Osinbajo.
“Ebe obibi ya bụ ebe ọna anọkaricha ugbua,nwere ihe nile eji arụ ọrụ.
“ọ bụ Chukwu na enye ndụ na ahụ-ike.obi di anyi ụtọ na omere ka onye-isi ala anyi gbakee n’ọria.anyi na ekpe ekpere ka Chukwu gwọcha ya ọria kpam kpam,” ka ogbakwunyere.

SHARE

2 COMMENTS

LEAVE A REPLY