APC abụghi maka mkpụchi ndị n’ada iwu-Oyegun

0
22

Onye isi otu jikọtara otu ndọrọndọrọ ọchichi nọọ n’isi gọọmenti ala Naijiria bụ otu All Progressive Congress,APC bụ Mazi John Oyegun, emela ka ọhaneze mata na ha abụghi ndi nchekwa maka ndi n’agba ọsọ idibe iwu obodo.

O kwụpụtara nke a, n’isi ụlọ ọrụ otu a dị na n’Abuja mgbe anabatara mmadu abụọ bụbụrụ ndi otu ndọrọndọrọ ọchichị Peoples Democratic Party,PDP bụ Senator Florence Ita-Giwa na Senator John Enoh na otu APC.

Onye isi otu jikọtara otu APC siri na nke a bụ iji kagboo echiche otutu mmadu n’eche na ndi n’achọ igbanari otu n’ahu maka ndi n’emegide iwu obodo na-agbabata n’otu APC ibia chekwaba onwe ha.

Mazi Oyegun mere ka amata na otu APC, bụ maka ndi nwere mmasi  irụ ọrụ.

“Ọbiabia ụnụ bụ ihe ziri ezi, ebe anyi jikwa ezi obi nabata ụnụ, n’ihi na ọrụ mgbanwe anyi n’akwado abụghi ihe aga emezu n’ime afọ anọ onye isi ala anyi nwere Ichi. Ihe ndi chere anyi aka mgba  n’iru di otutu, ma bụrụkwa ihe ekwesiri itinye uchu na ya. Otu ndọrọndọrọ ọchichi anyi nwere ezi añuri na udi mmadu unu, n’agbanyegi ihe niile nwere  ezi nchekwube ibia sonye n’ọrụ na I jere obodo ozi. Otu a abụghi maka, ‘bia nri ehela’…Oyegun kwụpụtara”.

O kwụpụtakwara obi ụtọ ya na mabata ndi Senator abụọ a si na steti Cross Rivers, di na mpaghara Niger Delta nke ala Naijira, ga-enye otu APC mgbasi ukwu ike na mpaghara Niger Delta.

N’aka nke ya, Senator Ita-Giwa kọwara mbata ya na otu a dika irute ụlọ.

O mekwara ka amata na ọpụpụ ya na otu PDP bụ

“apụrụ m n’otu otu ndọrọndọrọ ọchichi, were bata n’ọtu PDP, were rọọ ọrụ n’okpụrụ Obasanjo n’ime afọ anọ,rụọ  n’okpuru Yar Adua n’ime afọ abụọ mana ka ọ di ugbu a otu a ebidola laba azu, ebe otutu ihe ekwesighi ekwesi abatala n’ime ya. Nke a ka m anabataghi. Emekwara m ka aka chiburu ala Naijiria n’oge gara aga n’okpuru PDP mata nke a, ma mee ka ọ mata na enwegikwam nchekwube n’otu PDP . Ita Giwa kwụpụtara”.

Senator John Enoh kwụpụtara obi ụtọ ya n’ibata otu APC ma kwee kwa nkwa iwulite otu ndọrọndọrọ ọchịchị a na steti ya site na ihibe ọgbakọ digazi iche iche iji kpọkata ndi mmadu ọnụ na iwulite otu a.

 

 

Amarachi Nwanguma

SHARE

LEAVE A REPLY