Agwala ndi Uwe-ojii ka hụ n’enwere ezi mmek ọrita na etiti ha na ọhaneze

0
19

Onye ji ọkwa  Assistant Inspector General nke ndi uwe oji na mpaghara South West bụ AIG Agboola Oshodi-Glover amanyela ndi uwe oji ka hụ na enwere ezi mmekọrita n’etiti ndi uwe oji na ọhaneze ,ma si na ọbu ya ga-eme ka enwe ezi nchekwa.

Onye AIG kwuputara nkea mgbe ha na enwe nkparita ụka nke isi okwu ya bụ “Ime ka enwe ntukwasi obi nkea bụ na isi ogige ha na Steti Osun ka omere ka amata nkea.

O kwuru nkea mgbe onye Cọmmishọna ndi uwe oji na Steti  a kọwachara ọnọdu nchekwa na Steti Osun.

Adeoye kwuru na ngalaba ha nke Steti a na enwe nkparita ụka iji hụ na enwere ezi nchekwa,ma na arụkọkwa ọrụ ha na ndi eze obodo,iji hụ na enwere ezi nchekwa ndụ na akuluba.

Onye Cọmmishọna a deputara agam n’ihụ ha nwetara, iji maatụ nche ndi ime obodo na eme na ezigbo ibu agha megide mpu.

Na nzaghachi,onye  AIG toro ndi uwe oji ngalaba nke Steti a ma kwa ha ka ha ghara iji ike akpuru ndi mmadu.

Ma kwa ha ka ha n’eme ihe etu okwesiri iji mee ka ndi mmadu tukwasi ha obi.

SHARE

LEAVE A REPLY