Achigharila ụfọdụ ndi Permanent Secretary na ogige ọrụ gọọmenti etiti

0
62

Gọọmenti ala Naijiria achigharila ụfọdụ ndi Permanent Secretary na ogige ọrụ gọọmenti etiti.

Onye jigodu ọkwa dika onye-isi ala bụ okammuta Yemi Osinbanjo binyere  aka n’akwụkwọ nchighari ndia edeputara aha ha.

Engr. Abubakar G. Magaji ga-esi na ministry n’ahụ maka ọrụ na ụlọ obibi jee na ministry n’ahụ maka ihe na eme n’ala anyi.

Mohammad Bukar bụ onye nọbụ na ụlọ ọrụ ode akwụkwọ gọọmenti etiti ga ejiwe ministry n’ahụ maka ọrụ na ụlọ obibi.

Ebe Dr Roy Ugo bụ onye nọbụ na ụlọ ọrụ ode akwụkwọ gọọmenti etiti ga ejezxi na ụlọ ọrụ General Services Office n’’olu bekee, na otu ụlọ ọrụ ahụ.

Ndi nile nkea metutara ga amalite ọrụ ngwa ngwa tupu ụbọchi Fridee, dika onye isi ọrụ gọọmenti etiti bụ oriaku  Winifred Oyo- Ita sin nye ntuzi aka.

SHARE

LEAVE A REPLY