Aga eleba anya n’ụgwọ ọrụ ọhụrụ na ụbọchi ndi ọrụ

0
195

Akpọkuola gọọmenti Naijiria ka omee ngwa ngwa leba anya na ụgwọ ọrụ ọhụrụ iji welata oke ihe isike nke ndi ọrụ.
Osote onye-isi ndi ọrụ nke akọrọ Nigeria Labour Congress,NLC n’olu bekee ma bụkwara onye isi oche n’ahụ maka ụbọchi ndi ọrụ nke afọ puku abuo na iri na asaa bụ Comrade Peter Adeyemi kpọrọ okua na Abuja dika ihe so na nkwadobe ụbọchi ndi ọrụ ga adi na Mọndee abali mbu nke ọnwa ise.
Comrade Adeyemi gakwara n’ihu kwa ndi ọrụ ka ha were ohere a, rụsi a ọrụ ike iji mee ka ọnọdu akụlụba kawanye nma maka ọdinma ala anyi,ma yọọ ka etinye atumatu akụlụba nile na ọrụ.
“Anyi ga ewere ụbọchi ndi ọrụ a merube mmemme dika ndi na arụpụta ego nke ala anyi ji aga n’ihu”,ka okwuru.
Isi okwu ụbọchi ndi ọrụ nke afọ 2017 : “Mmekọrita ndi ọrụ na akụlụba: ileru ya anya”.

SHARE

LEAVE A REPLY