D.G VON,ekelela Emir Katsina ekele puruiche maka nkwado idinaotu

0
178

Onye  isi  ụlọ mgbasa ozi Voice of  Nigeria(VON)  bụ Osita Okechukwu  ekelela onye Emir nke Katsina, bụ Alhaji Abdulmuminu Kabir ekele pụrụ  iche ka o siri weputa ndu  ya  iji chekwaba ndi igbo na ụmụamala Naijiria ndi ozo bii na steti ya.

A  gaa-echeta na onye Emir a oge ọ na-agwa ndi nduu  na mpaghara ogbe ụmụafo igbo bii  na ya, tinyekwere ndi agburu ndi ozo bii na Katsina okwu ,  na o kwuru “Naijiria ga-aga n’iru I bụ otu, anọm  na njikere itọgbo ndu m I hụụ na ụdo chiri eze ma chekwaba ndu  nwa amala Naijiria ọ bụla  bii  na steti a. Anọm na njikere I ji obara m were chekwa ndi igbo.”

Onye Emir a katọrọ okuu  ndi otu jikọtara ndi ntorobia ndi Ugwu akpọrọ Arewa Youth Organisation kpọrọ ma nwekwa ụmụafọ igbo bii na mpaghara steti iri na itolu nọọ n’ugwu ala Naijiria ka ha kwara ngwongwo ha puọ na steti ha tupu ụbochi mbu nke ọnwa ọkotoba.

 

N’okwu ya ka ọ na-agwa ndi n’akwado otu All Progressive Congress (APC) okwu  na Eke di na steti Enugu n’ubochi Saturday, Mazi Okechukwu  kwupụtara afo ojuju  na nchekwube ya  nye ala Naijiria, n’agbanyeghi nhotanye na ọgbaghara nke ufodu ndi n’ado okwa ọchichi na otu di iche iche  n’esonye na ya iji kposa ala Naijiria.

Okechkwu gara n’iru keleekwasi onye Emir nke Katsina na ndi niile nyere mmasi na ọganiru nke ala Naijiria ma na ugwu ma na ndida, ndi n’akwado ụdo, ma n’ahụtakwa na ihe isi ike na nsogbu di na obodo taa, gaa emesi gabiga,ebe onweghikwa ike imetụta ibinotu n’etiti ụmụamala ya.

“site na akuko mere otutu afo gara aga,ka mba Amerika nwesiri ọgbaghara na tigbuo zugbo dapụtara n’etiti ndi ugwu na ndi ndida oge aluru agha obodo a, Amerika mesiri kwuru chim chim ma dirikwa na otu, nke anyi agaghi adi iche”

“anyi agaghi a bụ ndi odachi nye mmadu ole na ole sitere na South east na acho nkewa na ndi nke si na mpaghara ugwu na enye ha okwa oge I ji kwapu .Agha abughi oziza nye nsogbu na nhuju anya jụputara n’obodo ugbua , nke bụ nwa oge nta ma n’agafekwa agafe,” Okechukwu kwuru .

N’akuko na -efeghari na ufodu  ndi soo na ndorondoro ochichi n’akwado “Igbo gaa-alariri” ma n’amawaputa ezigbo ego maka nke a, Mazi Okechukwu kwuputara n’iwe na”anaghim ege asiri, ma ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ọ bụ oke na ọrụ diiri ndi ọrụ nchekwa ichuputa ndi ha bụ”

 

 

Amarachi Nwanguma

SHARE

LEAVE A REPLY