Emere ọgbakọ ekpere maka onye-isi ala bụ Buhari

0
653

Otu ọhụrụ nke akpọrọ the Buhari’s Friends Organisation Network n’olu bekee akpọkula ndi Naijiria ka ha kpe ekpere maka onye-isi ala bụ Presidenti Muhammadu Buhari igbake ngwa ngwa n’ute ọria.

Otu akpọrọ okua na Abuja mgbe ndi okpukperechi nile na-eme ekpere maka ahụ-ike onye-isi ala nakwa obodo anyi.

Mazi Athenious Okon bụ onye n’achikọta ndi otu a kwuru na ihe eji eme ekpere a bụ maka iji chọ ihu chineke,ka ọbia kwọ onye-isi ala ọria ma mee ka ala Naijiria na aga n’ihu.”

 “Ndi nọọ n’ebe a gunyere ndi ụka Christ na ndi ụka alakụba,Anyi nile biakọtara ọnụ ikpe ekpere maka ihụ-ike onye-isi ala makwa ala Naijiria iga n’ihu,” ka okwuru.

Mazi Okon kwara ndi ndọrọ ndọrọ ọchichi ka ha ghara iji ahụ-ike onye-isi ala eme ka osi-sọ ha,n’ihi na ọbu mmadu nke nwere ike iya ahụ mgbe ọbụla.

O kwuru na Presidenti Buhari agbala mbọr ime ka ala Naijiria di nma.

Onye-isi ala gara London maka ileta ahụ-ike na abali asa nke ọnwa ise.

SHARE

LEAVE A REPLY