Gọmenti Steti Kano eguzobela ngalaba gana ahụ maka ogige ahụ-ike ndi nkiti

0
670

Gọmenti Steti Kano ebinyela aka na akwụkwọ maka iwu ebe mmuta ahụ-ike nke ndi nkiti,nˊafọ puku abụọ na iri na asaa ka ọburu iwu.

Aka nachi Steti a bụ Dr. Abdullahi Umar binyere aka nˊakwụkwọ a,dika ndi ụlọ nzukọ omiwu Steti  kadoro ya ka oburu iwu.

Gọvanọ Ganduje kọwara na ebum nˊuche eji hiwe ogige ọhurua bụ maka inweta ezi ahụ-ike,nke gbakwasiri ụkwụ na usoro iwu gọmenti Steti nˊkwa nke etiti.

Ọ gara nˊihu kwuo na gọmenti gana eleba anya na ogige ahụ-ike ndia nakwa ndi ọrụ ha iji hu na-agaghi ana ndi mmadu oke ọnụ ahia karia ka okwesiri.

“Ngala a nelekota ụlọ ọgwu ahụ-ike, ka gọmenti nwere ikikere imechi ụlọ ọgwu ọbụla na-anaghi eme ihe iwu kwuru ma hụkwa na ha na- utu utu ha nke ọma nˊaka gọment…ha ga elebakwa anya na ndi mgbọrọgwu na nkpa-akwụkwọ nakwa ndi nˊenye ọgwu alakuba,” Gọvanọ Ganduje kọwara nkea.

Gọvanọa kwara ariri na ọtụtụ ụlọ ọgwu dina Kano enweghi akọrọngwa mọbụ ezi ndi ọrụ ahụ-ike iji lekota ahụ-ike ohaneze.

 

SHARE

LEAVE A REPLY