Gọọmenti mba Britain ga-eguzobe ọdọ ahia na Kano

0
42

Gọọmenti mba Britain ekwuputala njikere ha iba guzobe ọdọ ahia na Steti Kano iji kwado mmepe.

Onye cọmishọna ugwu n’ala naijiria bụ Mazi Paul Arkwright kwuru nkea na Kano mgbe ọgara zute onye jigodu ọkwa dika gọvanọ steti Kano bụ Prof. Hafizu Abubakar na obi steti a.

Arkwright kwuru n’ọgara Kano iji leta ọrụ arụrụ bụ ndi Department of International Development (DFID) n’aha ichafu na agụm akwụkwọ nakwa ahụ-ike.

Obi di onye cọmishọna ụtọ maka ihe arụrụ na ogige agụm akwụkwọ na ahụ-ike na state a.

He particularly noted the Teacher Development programme that was ongoing at the Sa’adatu Rimi College of education, describing it as impressive.

Inye ndi nkuzi ọzụzụ di nma,ma anyi n’ele anya ihụ ezi mmekọrita n’etiti Steti Kano na Gọọmenti Britian,’’ ka okwuru.

Onye jigodu ọkwa gọvanọ Kano bụ Abubakar kwuru na obi di gọọmenti steti ya ụtọ maka na ndi DFID gbatara ha ọsọ nyem aka n’ogige ahụ-ike na agụm akwụkwọ.

Na inye ndi nkuzi ọzụzụ,pacenti iri ise na ndi nkuzi enwere na steti a etozughi oke ya mere oji di mkpa inye ha ọzụzụ.”

ka ọdi ugbua anyi nwere ndi nkuzi di puku iri ise na asatọ n’ogo primari na steti a ma ọtụtụ n’ime ha enweghi ọzụzụ dika ndi nkuzi,’’ ka okwuru.

Abubakar nabatara nkpebi gọọmenti Britian ibia guzobe ọdọ ahia na steti a ma kwuo na ọbụ ihe ziri ezi.

 

Abubakar gara n’ihụ kasie onye cọmishọna obi maka nkusu mere na London nso nsoa,ma kwuo mkpa ọdi ka ndi isi mba ụwa jikọ aka ọnụ kwusi omume ọjọọ a.

SHARE

LEAVE A REPLY