Gọvanọ Kogi akatọla nkusu mere na-ụlọ ụka na Anambra

0
612

Aka na-achi Steti  Kogi bụ  Gọvern Alh. Yahaya Bello akatọla nkusu mere na ụlọ ụka Catholic dina Anambra, ma kwuo na nkea bụ ihe ọjọọ megidere  ọtụtụ mmadu.

O kwuru nkea na na Lokoja site n᾽aka onye Director General ya na mgbasa ozi,Alh,Bello kwuru na ndi mere ihe ọjọọ a ka aga anwuchi site na usoro iwu,ma gaa n᾽ihu kwuo na ọ bụ ọ chichiri gbara na ehihie n᾽ala anyi.

“Ogbu gbu a egburu ndi Anambra bihe  ọjọọ megide mmadu nile,anyi nile ga eguzoro maa chekwa ndu anyi n᾽aka ndi ogbu mmadu naka ndi obi ọjọọ.

“Ejim obi ebere n᾽asi eziulo nile,ndi Anambra ndi nkea meturu ka ha kara obi,nakwa ndi Naijiria na nwannem nwoke bụ Governor Willie Obiano. Anyi ga agabigacha ihe ọjọọ a ma siwanye ike”.

 

SHARE

LEAVE A REPLY