Gọvarnọ Okowa ekwela nkwa irụzicha ama egwuri egwu di na Asaba

0
588

Gọvarnọ Ifeanyi Okowa nke Steti Delta ekwela nkwa irụzicha ama egwuri egwu di na Asaba n’ime ọnwa iri na abụọ,tupu amalite egwri egwu mba Afrika nke afọ puku abụọ na iri na asato,nke akọrọ 2018 Africa Athletics Championships n’olu bekee na Asaba.

Okowa kwuputara nkea mgbe ọna enwe nzuko n’obi dina okpuru ọchichi  Oshimili South nke steti na ụbọchi Tuuzdee.

O kwuru n’irụcha ama egwuri egwu a bụ ihe di oke mkpa n’ọchichi tinye ikwalite egwuri egwu na steti a.

Ama egwuri egwu Asaba bụ nsogbu anyi nwere,ọ ga eri steti a nde kwuru ndee abụọ naira,” ka  gọvarnọ kwuru.

Anyi ga anabata ndi kwuru na nke onwe ha,iba tinye ego ma arụcha ama egwuri egwu.

Ama egwuri egwu ka arughi etu okwesiri,ya mere agaghi enwe egwuri egwu mba ụwa, anyi ji chọ iruzicha ya ka otozuo ogo ikpọ ya ama egwuri egwu.

 Anyi n’agba mbọ inweta ezigbo ndi ọrụ ngo ma anyi nwere nchekwube na ndi chọrọ iba tinye ego n’ọrụ a di njikere imalite ọrụ ngwa ngwa.” ka okwuru.

 

 

SHARE

LEAVE A REPLY