Ihe kariri umuakwukwo nde ato ka- aga enye nri n’afo a

0
44

Ihe kariri nde atọ ụmụakwụkwọ ọta akara ka amawapụtara gaa eketa oke n’atumatu inye nri nke ochichi gọọmenti Muhammadu Buhari nke afo a n’ala Naijiria.

 

Onye nnochite anya puruiche nke Onye isi ala na ihe gbasara nta akụkọ na mgbasa ozi, bụ Laolu Akande mere ka amata nke a unyahu bụ Sunday.

 

Ka ọ di ugbua, ihe kariri otu nde na okara ụmụọtakara ka ana enye nri site n’atumatu a, ebe akpọrọ n’oru mmadu puku iri na anọ, isi nri maka imejuputa ya bụ atumatu.

 

Akande mere ka amata na site n’atumatu a,steti itolu eketala oke na ya, ebe akwuọla ugwọ ọnụ ego Naira ijeri atọ na oma assa ka ọ di ugbu a.

 

“steti ndi nwetara oke n’atumatu a gụnyere Anambra,Enugu,Oyo,Osun,Ebonyi,Zamfara,

Delta,na Abia enwetasila ọnụ ego di iche iche,ka ọ di ugbu a, ebe ndi na esi nri, mmadu puku iri anọ na nari ise,iri assa na anọ ka ekesara oru n’ime ime ebe ụlọ akwụkwọ ndia nọọ, “ o mere ka amata.

Dika o mere ka  amata na ego ndia ka gọọmenti etiti jiri aka ha akwunye n’akpa ego ndi a n’esi nri, beluso na steti Osun, ebe ufodu ngwa ihe oriri dika akwa, ka ana -azukọta ọnụ site n’aka onye  nwere ebe ana azu ọkukọ.

Ka esi akwu ugwo

Ugwo ana akwu  n’ime steti itolu na ụmụakwụkwo ole ana enye nri gunyere:

 

 

*steti Anambra nwetara  N693,013,300, nke akwuru  ugboro asatọ  otu a; N53,684,400, N67,462,500, N68,570,600, N70,387,100, N70,950,600, N71,480,500, N145, 238, 800 na  N145, 238, 800, n’otu na otu  ebe ọnụ ọgugu ụmụakwụkwọ   103, 742 ka enyegoro nri.

*na steti Enugu amawaputara  N419,427,200  ugboro isii  nke gunyere: N67,244,800, N67,244,800, N69,570,900, N69,570,900, N69,570,700 na  N76,225,100 n’otu na otu ,ebe ụmụakwukwo 108,898 ka enyegoro nri..

*na steti Oyo amawaputara  N414, 708, 700  maka inye  umuakwukwo 107,983 nri  nke ekesara ugboro isii N72, 288,300, N66, 622, 500, N66,736,600, N66,736,600, N66,736,600 na N 75,588,100.

*steti Osun bụ, N767,483,244 n’ugboro asato  N58,299,130, N62,089,580, N49,671,664, N62,089,580, N62,089,580, N49,217,310, N212,013,200 na  N212,013,200 n’otu  na otu, iji nwee ummuakwukwo  151,438  nri..

*n’otu aka ahu,akwuola steti Ogun  N880,055,400 ugboro assa nke gunyere N119,648,900, N119,648,900, N119,648,900, N119,648,900, N 119,648,900, N119,648,900 na N162,162,000  ebe enyela umuakwukwo 231,660 nri site n’atumatu a..

*Ebonyi  nwetaraN 344,633,100  nke akwunyere ugboro ato N115,218,600, N115,218,600 na  N114,195,900  iji nyee umuakwukwo 163,137  nri.

Zamfara, Delta na  Abia  nwetara  N188,001,100, N63,366,100, N42,921,200, iji nye umuakwukwo 268,573, 90,523 na  61,316 nri n’otu na otu

Steti ato ndia soo n’azu,  kaa sonyere na ya bụ atumatu  inye nri n’ulo akwukwo

Ndi na esi nri akporo n’oru na steti  Anambra, Enugu  na Oyo di  1009, 1, 276,  n’otu na otu ,ebe 1, 372 , 2, 863, 2, 205 na 1, 453 ka akporo na steti Osun, Ogun and Ebonyi .

Na  Zamfara ,ndi n’esi nri mmadu  2,738 ka akporola, ebe  908 na 750 ka akporo na steti Delta na  Abia  n’otu na otu

 

Amarachi Nwanguma

 

SHARE

LEAVE A REPLY