Mmadu iri na ise kana achọ achọ,dika ụlọ elu ikwu asaa dara na Nairobi

0
46

Mmadu iri na ise kana achọ achọ,dika ụlọ elu ikwu asaa dara na Nairobi isi obodo Kenya n’ isi ụtụtụ ụbọchi Tuzdee.

Ụlọ elu a di n’ebe akpọrọ Kware Pipeline, Embakasi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nairobi,ka ozi kwuru na nwere  mgbawa,ebe ọtụtụ ndi bi na ya ka achupuru tupu ụlọ a adakposia.

Ndi ọrụ Red Cross nke mba Kenya ka ọdi ugbua na eme nnyocha iji naputa ndi mmaduna ebe ụlọ a dara adaa hana ndi ọrụ nche ọzọ ma ndi n’ahụ maka ogbaghara gunyere ndi Saint John’s Ambulance service n’olu bekee bụ ndi keuputara ọnụ ọgụgụ ndia ana achọ achọ.

Afọ gara aga,ihe kariri mmadu iri atọ nwuru mgbe ulo elu ikwu isii dakwara  na Nairobi na mpaghara Huruma ebe ọtụtụ mmadu ka ana achọ-achọ ebe ọtụtụ ka azọtara ndu ha

Ihe mere ụlọ a ji daa bụ maka oke mmiri ozuzo makwana arụsighi ya ike etu okwesiri.anwụchiela onye nwe ụlọ a ka ọdi ugbua.

SHARE

LEAVE A REPLY