Naijiria eguzobela otu ga-eleba anya na mahadum ndi ọhụrụ

0
75

Gọọmenti ala Naijiria eguzobela otu mmadu asaa ga-eleba anya na etu esi mefue ego enyere  mahadum iri na abụọ ọhụrụ nke gọọmenti etiti.

Na iguzobe otu Cọmmittee na Abuja,onye Minister n’ahu maka agum akwụkwọ bụ Adamu Adamu kwuru na inyocha mahadum ndia gbakwasiri ụkwụ na amuma gọọmenti di ugbu a nke kwụrụ na ime ka ọhaneze mara etu esi emefu ego.

Adamu kwuru na ọ bụ maka mkpesa ana enweta site n’aka ndi nwere agba na agum akwụkwọ,ndi isi mahadum ọhụrụ nakwa ndi  ndu obodo ebe mahadum iri abụọ ndia di kpalitere nnyocha a.

Omere ka amata na etu ọdi ugbua, ndi EFCC n’aha ichafu na eleba anya n’ebubo mmefu ego a  enyere ụfọdu mahadum.

Otu a mejuputara mmadu asaa, ka eguzobere ka ha leba anya n’ọrụ ndi eji ego a enyere ndi mahadum rụpụta,” ka okwuru.

Adamu gbakwunyere na ọ bụ ndi mara nke ekwe kụrụ ma kwesikwa ekwesi bụ ndi ahọpụtara ka ha leba ya anya.Ndi cọmmittee a bụ ha ga amara ego ole enyere bụ ndi n’ahụ maka mahadum nke akpọrọ National Univetrsities Cọmmission n’olu bekee site na-aka ndi Tertiary Education Trust Fund.

Ndi otu a ga achọputa ma mara ole ọdi bụ ọrụ arụrụ,makwa ego ole enyere maka mmalite ọrụ.nkea ga emara ego ole emefuru n’ọrụ ọbụla makwa ego ole fọduru,ma chọputa ihe achọrọ n’ogige mahadum iri abụọ ndia.

Otu a mejuputara mmadu asaa gunyere; ọkammuta Olufemi Bamiro,onye jibu ọkwa vice chancellor nke mahadum Ibadan na Mazi Lawal Abubakar. Ndi ọzọ; Engineer Mansur, Architect Umar Aliyu, Mazi Friday Ezenwa, ọkammuta Patrick Oshio na ọkikpe Kefas Magaji.

Izuka iri na abụọ ka eweputara maka ime nnyocha a.

 

 

SHARE

LEAVE A REPLY