Naijiria ga-akwado ndi oji ego achụ ego n’ngalaba ọkụ latrik

0
57

Emir nke  Kano bụ Alhaji Muhammadu Sanusi II akpola gọọmenti etiti na nke steti ka ha kwado ndi oji ego achọ ego n’ogige ọkụ latrik.

O kwuru nke mgbe ọna akuzi ihe na ọgbakọ abali abụọ, iji cheta n’omela afọ iri ise ekeputara Steti Kano.

Ọgbakọ a bụ ndi gọọmenti steti Kano chikọbara ya iji merube ncheta ha.

O kwuru na ọdi mkpa bụ ikwado ndi ji ego achụ ego na ngalaba ọkụ latrik iji bulie ọnọdu akụlụba ndi mmadu na ala anyi.ma si na ọdi mkpa itinye ego na ngalaba ọkụ latrik iji bulie ọnọdu akụlụba steti na nke ala anyi gba gburu gburu.

Anyi ga etinye ego na mmepe obodo Kano nakwa ala anyi gba gburu gburu.’

Onye eze a, kwara ariri maka ndala azu nke ọkụ latrik n’ala Anyi,ma kwuo na ọtụtụ ụlọ mmeputa ngwahia ụfọdu akwusila nihi enweghi ọkụ.ma kpọkuo goomenti Steti Kano ka oleba anya na agum akwụkwọ nke ka nke nke nwata nwanyi.

Agum akwukwo bụ isi sekpu nti na mmepe obodo.Anyi kwesiri ikwado ya maka na ọbụ ya ga eme ka obodo anyi mmepe,” ka okwuru.

“Gọọmenti ga eleba anya na ọrụ ụbi na ụlọ mmeputa ngwahia maka  na ha bụ isi sekpu nti, iji mee ka steti na ala anyi ga nihu” ka okwuru.

Ma kọwa na na ọbu ndala azu nke ụlọ mmeputa ngwahia mere ala anyi ji atụbata akpụkpụ-ụkwụ ndi ndee atọ n’ọnụ ọgụgụ site na mba china kwa afọ.

Anyi ga agbanwe etu anyi si eche echiche;anyi ga agba mbọ igbo mkpa ndi nile chere anyi aka mgba iji hụ na ọnọdu akuluba bụ nke ga adi nma na Steti a.”ka okwuru.

Ọgbakọ a bụ nke ndi nile nwere agba ma ndi ọnụ n’eru n’okwu sitere na steti nakwa ebe ọzọ biara.

 

SHARE

LEAVE A REPLY