Ndi ji akwụkwọ ikikere igwuputa akụ n’ala ka aga akwado n’ime obodo

0
43

Alhaji Sani Shehu bụ  onye isi oche otu ndi n’egwuputa aka-chinyere n’ala nke akpọrọ n’olu bekee Miners Association of Nigeria,ayọla ndi eze obodo na ndi okpuru ọchichi obodo ka ha hara inọ akwusi  ndi ji akwụkwọ ikikere igwuputa akụ-chinyere irụ ọrụ etu okwesiri.

Shehu kwuru na  Abuja n’ụfọdụ ndi eze obodo na njikọ aka nke ndi okpuru ọchichi n’eme ka ọnọdu siere ndi na- egwuputa ngwa akụ chi-nyere n’ala bụ ndi n’arụ ọrụ na obodo ha.

O kwuru na iji maatu,ihe ahụtara na Niger na Zamfara, mgbe ndi otua biara maka nsogbu a.

Anyi enwela otutu ihe iji maatu ebe ndi eze obodo nan di isi okpuru ochichi ekweghi ka ndi otu anyi ruo oru,dika ha mechara ihe ndi obodo siri ka ha mee; nkea bu oke nsogbu n’echere ndi otu anyi aka mgba.”

Ọtụtụ oge ndi eze a na ndi isi oche a n’ekwu ihe na enwghi isi,sina ọbụ ya mere ha ji achọghi ka ndi otu anyi rụọ ọrụ; mana akwado ndi n’egwuputa akụ chi-nyere n’ụzọ mkpuke maka uru ha na enweta na ya,” ka okwuru.

Ma yọọ ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyem aka,dika ụfọdụ ndi otua ka ọna esiri ike irụ ọrụ ha ebe ha na’egwuputa ngwa akụ chinyere,maka nsogbu ndi eze na ndi isi oche okpuru ọchichi ime obodo.

Ma ga n’ihu yọọ ka gọọmenti etiti zigakwuo ndi ọrụ nche,n’ogige nile ebe ana egwuputa akụ chinyere na-ala gba gburu gburu ala anyi maka inye ndi ọrụ anyi ezi nchekwa.Na nkea ga enye aka maka ibelata ndi adigboroji gba gburu gburu ala anyi.

 

SHARE

LEAVE A REPLY