Ndi omiwu ebinyela-aka na akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ puku abụọ na iri na asaa

0
49

Ndi ụlọ nzụkọ omiwu ala Naijiria ebinyela aka na akwụkwọ ego mmefu nke afọ puku abụọ na iri na asaa nke di ngeri kwuru njeri naira asa na uma nari anọ,iri anọ na otu site na ntuzi aka ndi cọmmittee n’ahụ maka okwu ego.

Nke a nwere isi site ntule emere na akwụkwọ ozi ndi cọmmittee a nyere ndi omiwu na ọgbakọ ụbọchi Thursdee, site n’aka onye isi oche ha bụ Senator Danjuma Goje.

Njeri kwuru njeri naira asaa na uma nari anọ iri anọ na otu nke ndi omiwu binyere aka na ya,ji ihe kariri njeri naira nari abụọ wee karie njeri kwuru njeri naira asaa na uma irei abụọ na itolu nke onye-isi ala bụ Muhammadu Buhari nyere na ọnwa iri na abụọ nke afọ gara aga.

Na ndi sinate kwenyere na ihe ndi cọmmittee  a n’ahu maka mmefu nke afọ puku abụọ na iri na asaa kwuru,’” Senator Goje kwetara.

Ọ gara n’ihu kwuo na ihe mere ego a ji karie nke onye isi ala nyere na mbụ bụ maka mkpa ọdi bụ ime ka mmepe rutucha mpaghara ala anyi nile.

Ụfọdu ebe a gunyere okporo ụgbọ oloko si  Ajaokuta-Itakpe ruo Delta,ụzọ ụgbọ elu nke abụọ na ọdu ụgbọ elu Nnamdi Azikiwe dina Abuja,ma irụ ọdu ụgbọ elu ọhụrụ na Abeokuta iji nyere ọdụ ụgbọ-elu Murtala Muhammed airport dina Lagos aka.

Osote onye isi Sinate bu Ike Ekwerenmadu kwuputara obi ụtọ ya na akwụkwọ ego nkpata na mmefu nke afo nke barakọrọ ya na akwụkwọ nile gbasara ya,na abughi nke gara aga akwụkwọ nkpata na mmefu bara tupu akwụkwọ ha na ya so abia.

Ma too ndi ala anyi maka ezi nghota na nkwado ha n’oge ana eleba anya na ego nkpata na mmefu,ma marakwa na ihe nile agbanwela nke ọma.

Ego nkpata na mmefu nke afọ a pụrụ iche maka na ọbụ nke mbụ ala anyi na eme ka ọhaneze mara etu osi aga,anyi nwere ike inweta nke afọ na-abia abia ka anyi nwe ike ileba ya anya n’ogeSenator Ekwerenmadu kwuru nkea.

Presidenti ndi Sinate bụ Dr. Bukola Saraki yọrọ ndi isi ọchichi ka ha na agba mbọ edeputa ego mkpata na mmefu ngwa ngwa etu okwesiri.

SHARE

LEAVE A REPLY