Ndi omiwu mba German akwadowo nwoke ilụ nwoke ibe ya mọbụ nwanyi ilụ nwanyi ibe ya

0
551
German Chancellor Angela Merkel gestures as members of the lower house of parliament Bundestag vote on legalising same-sex marriage, in Berlin, Germany June 30, 2017. REUTERS/Fabrizio Bensch

Ndi ka n’ọnụ ọgụgụ na ndi omiwu mba German agwadola ka nwoke lụọ nwoke ibe ya mọbụ nwanyi ilụ nwanyi ibe ya,ka ụbọchi ole n’ole  gara dika Chancellor Angela Merkel wepuru otu vootu.

Nkea enyela ụmụnwoke na edine nwoke ibe ha ohere ilụkọ ma nwe ike izuta ụmụ aka.

Ndi nagbasa ndi otu ndọrọ ndọrọ Oriaku Merkel mgba bụ ndi na akwado nkea.ebe oriaku  Merkel nyere ndi omiwu ohere na ụbọchi Mọọndee,akwadoghi atụmatua.

O kwara ndi otu ndọrọ ndọrọ (CDU) n’aha ichafu ka ha to soro ihe obi ha kwara ha”.

Norbert Lammert bụ onye isi ndi omiwu kwuru na nari atọ iri itolu na mmadu atọ kwadoro atụmatua, ebe mmadu nari abụọ iri abụọ na isii siri mba ma mmadu anọ anọghi ya.

Iwu mba German n’ekwu ugbua: Agbam akwụkwọ bụ na etiti nwoke na nwanyi mọbụ nwoke na nwoke.

SHARE

LEAVE A REPLY