Ndi omiwu Sinate alọghachela ka izu ụka abụọ gachara

0
620

Ndi ụlọ nzukọ omiwu Sinate nke ala Naijiria lọhachitere nzukọ n’ụbọchi Tuesdee dika ha gachara ezum-ike izu ụka abụọ,maka mmemme ndi ụka alakuba akpọrọ Eid-el fitri,nke emere na izu ụka gara aga.

Ka ha lọhachiri, ndi omiwu a tulere nhọputa nke Mazi. Lanre Gbajabiamila dika directọr general nke  Nigerian Lottery Commission,nke ọ bu onye jigodu ọkwa dika onye-isi ala bụ ọkamuta Yemi Osibanjo họputara ya.

Sinate siri ka ihe ọbụla banyere inyocha nhoputa ndi isi ọchichi mere chere ruo mgbe aga eruwe isi nye ntuzi aka nke iwu n’achi ala anyi na ihe bayere nyocha.

Ma were ohere a kwa onye jigodu ọkwa onye-isi ala ka osoro usoro iwu na ihe gbasara nhọputa.

Ndi omiwu a anabataghi oku nke ọkamuta Yemi Osinbajo,nke kwuru ka edu ndi cọmmishọna n’ahụ maka ntuli aka n’iyi ọrụ tupu ha aga ezum-ike ọzọ.

 

SHARE

LEAVE A REPLY