Ndi uwe oji akpọla aha onye tụrụ ogbunigwe na Manchester

0
62

Onye anasi na ọ bụ ya tụrụ mgbọ ogbunigwe n’ogige  Manchester ka asi na aha ya bụ Salman Abedi.

Etu osinadi,ndi uwe oji nke Manchester siri na ha emechabeghi nchọpụta,ya mere ha agaghi ekwu okwu nke ukwu.

Salman so na mmadu iri abụọ na abụọ mgbọ ogbunigwe ahụ gburu.

Mmadu atọ nkea metutara ka akpọrọ aha.Saffie Rose Roussos bụ onye di afọ asatọ , Georgina Callande nakwa John Atkinson.

Ndi ọzọ nkea metutara ka aga akpọ aha ha dika ana ebuputa ozuu ha.

Akwala ezinụlọ ọbula na achọ onye nke ha achọ ka ha kpọtụrụ ndi uwe oji n’ekwe nti, dika esi kwuo na mgbasa ozi ha.

SHARE

LEAVE A REPLY