Ndi uwe ojii Uganda anwụchiela ndi Congo batara obodo ha na-ụzọ n’ezighi ezi.

0
31

Ndi uwe ojii na mpaghara Kasese anwụchiela ihe kariri mmadu otu nari iri atọ bụ ndi mba Congo maka ibata Uganda na ụzọ n’ezighi ezi.

A na-ekwu na ndia banyere Uganda ma nọrọ n’akụkụ mmiri Kayanja ma mmiri Lake George dina obodo Katwe-Kabatoro izu ụka gara aga n’enwetaghi akwụkwọ ikikere sitere n’ụlọ ọrụ na ahụ maka ibata na ala Uganda.

Ndi a ana-enyo enyo ji akara njiri mara adigboroja nke ndi Uganda mgbe ana eme ntuli aka elu’ akara njiri mara  a ka ha ji gafe ndi nche nọọ na ụzọ esi abata  Ugandan dika ndi obodo.

 “Anyi na atu egwu dika ndi nche na Uganda n’ndi ọjọọ ga eji ohere a si ụzọ mmiri a bata Uganda n’enweghi akwụkwọ ikikere,kamgbe ndi agbatobi anyi n’’enwe nsogbu ndọro ndọrọ nke mere anyi ji atụ egwu na ha nwere ike iwakpu anyi,” osote onye cọmmishọna ndi uwe ojii na Bwera bụ Mazir Vincent Mwesigye kwuru nkea.

Mazi Mwesigye kwuputara na,ndi uwe ojii na ndi ọrụ nche nọọ na  Mpodwe lhubirugha dina oke ala Uganda na DR Congo mere nkpocha  a na ụbọchi Fridee na Kayanja ebe anọ nwụchie ndi Congo nakwa ndi ọjọọ n’abata obodo anyi n’ụzọ na ezighi ezi site mmiri George ebe anyi nwere oke ala anyi na mba DR Congo.

“Ndi ọjọọ a na awakpuo anyi n’esikari na ụzọ Kayanja ya mere anyi ji enyo ha enyo,” Mazi Mwesigye gbakwunyere nkea.

 

 

SHARE

LEAVE A REPLY