Nke mbụ onye Afrika ga-abụ Direktọ genara nke WHO

0
77

Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onye si mba Ethiopia ga-ewere ọkwa dika Direktọ general nke ndi World Health Organization, WHO n’aha ichafu.

Ọ ga abụ onye Afrika mbụ bụ onye-isi ngalaba UN,dika onwetachara votu di otu nari iri asatọ na isii site na obodo so na otua.Ọ ga anọchi Margaret Chan bụ onye ga aritu n’oche ọchichi na ọnwa June dika ọga eme afọ iri ọchiri ọchichi.

Mgbe Margraret nachi,etu WHO siri leba anya na ọria Ebola na mpaghara West Africa bụ nke ana asi n’ọdighi nma.Ana ekwukwa na otu a adoghi ndi mmadu aka na nti ngwa ngwa maka ọria malitere na ọnwa Decembanke gburu mmadu di puku iri na otu n’’ọnụ ọgụgụ.

Mgbe ọna agwa ọgbakọ ahụ-ike mba ụwa okwu tupu amalite ntuli aka elu Dr Tedros kwuru na ọ gana etinye uchu na ọnọdu gbata gbata ọbụla daputara etu okwesiri.Ma kwe nkwa igbatara ndi n’enweghi ka ọhara ha ọsọ enyem-aka.

Ihe anyi ga eme bụ ihụ na ezi ahụ-ike gazuru ụwa nile.agaghi m ezu ike ma ọbụrụ na nkea emegbi,” ka okwuru.

Banyere Dr Tedros
Dr Tedros jibụ ọkwa dika onye minister ahụ-ike na ihe gbasara mba ọzọ na  Ethiopia,makwa onye isi oche bọọdụ nke n’ahụ maka ego mba uwa ji ebu agha megide ọria obiri na aji ọcha,ọria ụkwara nta na ọria iba.

Ọ bụkwa onye mba ụwa mara maka nchọpụta n’ihe banyere ọria iba,ma jiri nzere phD na ahụ-ike ime obodo nke nwa bekee kpọrọ community health.

Nhọputa bụkwa nke nwere obere nsogbu,maka na-ana ekwu na ọna ezochi ọria ọgbụgbọ na ọnyụnyụ di atọ n’ọnụ ọgụgụ nke daputara na Ethiopia,ebe ndi na akwado ya n’asi na ọbụghi ezi okwu.

Dr Tedros kwuru na ya lewere anya dika direktọ general ọhụrụ inwetaMba ụwa ebe onye ọbụla ga enwe ezi ahụ-ike n’agbanyeghi onye ọbụ mọbụ ebe obii”.

Ọ gwara ndi nnọchite anya ọgbakọ ahụ-ike mba ụwa na“Ana m ekwe unu nkwa n’nga ebili kwa ụbọchi ọbụla,ma mee ihe di icheadi m njikere irụ ọrụ.”

 

SHARE

LEAVE A REPLY