Ọkikpe ukwu ala Naijiria akwala ndi ala-anyi ka ha rube isi nye ikpe nkwụmọtọ.

0
560

Okikpe ukwu ala Naijiria,bụ okikpe Walter Onnoghen akwala ndi naijiria ka ha rube isi nye ikpe nkwụmọtọ.

Okikpe Onnoghen kwuru nkea mgbe ana eme mmemme ikwanyere ya ugwu na Calabar International Conference Centre, Steti Cross River nke Naijiria.

O kwara ndi mmadu nke ka nke ndi ndọrọ ndọrọ ọchichi,ka ha wepu aka na mpụ,maka na ọna emegide udo na idi n’otu ala anyi.

Mgbe anyi ga anabata usoro iwu ma hapu mpụ,ala anyi ga aga n’ihu.Anam  agwa ndi ala anyi ka anyi hapu ụzọ ochie eji eme ihe ma rube isi nye iwu maka ọdi mma ndi ala anyi,” Onnoghen kwuru nkea.

O kwara  Ndi Naijiria,ndi nọọ na ụlọ na ndi nọọ na ụzọ ije ka ha gba mbọ rube isi nye iwu n’achi ala Naijiria.ọbụrụ na anyi mee nkea,Anyi ga enwe udo na idi n’otu na ala anyi.”

Onnoghen kwuputara obi ụtọ ya nye ndi gọọmenti Steti ya maka ikwanyere ya ugwu,nyo ka akwado ikpe nkwumọtọ maka ọdi nma ndi mmadu.

Dika osi kwuo, “obi dim ụtọ ilota ụlọ ma iruru ndi mmadu ọrụ nakwa ala anyi.Anam ayọ unu ka unu na ekpere m ekpere nakwa ala Naijiria.”

Ọkikpe  Onnoghen bụ onye enyere akwụkwọ nsọ na efere ọlaedo n’aka Gọvọnọ Ben Ayade nke Steti Cross River, kwuru na “Achọrọ ibụ onye okiwu otu ọbọla osi di,ma ọbụghi onye okikpe. Nkpebia ka omere maka m ma ekelere m chineke.”

Gọvọnọ Ayade mgbe ọna enwe ọkikpe Onnoghen onyinyi,kpere ekpere ka chineke nye okikpe ukwu ala Naijiria amamihe ọ ga eji arụ ọrụ site na ekwu nke chukwu,ma menyere nwaokeke na okafọr n’agbanyeghi ebe onye si, mọbụ okpukpere chi onye ahụ.

Ndi bara mmemme a gunyere ndi ọkikpe ụlọ ikpe kachasi nke akpọrọ Supreme Court n’olu bekee, Gọvọnọ nke Steti Niger bụ  Abubakar Sani Bello;osote ya bụ Ahmed Muhammad Ketso na ndi onye jibu ọkwa gọvọnọ Steti Cross River bụ Mazi. Donald Duke na Sinator Liyel Imoke nakwa ọtụtụ ndi ọzọ.

 

SHARE

LEAVE A REPLY