Onye-isi ala bụ Muhammadu Buhari ejewela London maka ahu-ike ya

0
763

Onye-isi ala bụ Muhammadu Buhari ejewela London maka ije leba ahu-ike ya anyi.

Nkea di na okwu obinyere aka bụ onye ndụm ọdụ pụrụ iche nye onye-isi ala na mgbasa ozi bụ Mazi Femi Adesina, ọchọbụrụ ime njem a na ehihie ụbọchi ụka,ma si ka ochere maka nlọta ụmụ agbọghọ Chibok di iri asatọ na abụọ na Abuja n’ụtụtụ ubochi ahu.”

Adesina gbakwunyere naoge onye-isi ala ga anọ na mba London bụ onye dibia oyibo ya ga ekwu nkea.ihe gana aga etu okwesiri dika osote onye-isi ala nọọ ya.”

Presidenti Buhari edegalara ndi ụlọ nzukọ omiwu akwụkwọ maka njem ya dika usoro iwu ala Naijiria si kwuo.

Onye-isi ala kwere ndi Naijiria nkwa na onweghi nsogbu ọbula,ma kwuo obi ụtọ ya dika ndi mmadu si ekpere ya ekpere ma nwe olilanya na ha gana ekpe  ekpere maka udo na idi n’otu nke ala anyi.

 

SHARE

LEAVE A REPLY