onye-isi otu AU agwala ndi mba so na otua ka ha n’akwunye ego etu okwesiri

0
26

Onye isi oche otu mba afrika nile akpọrọ  African Union Commission (AU) bụ  Moussa Faki Mahamat akpọkula ndi mba nọọ na otua ka ha mee ka esi kwekọrita site na inye ego enwetara na ntubata nkwa ahia,iji kwado otu AU.

Mahamat kwuputara nkea mgbe ha na enwe nkparita ọka maka ọgbakọ nke iri abụọ na itolu nke ga ewere ọnọdụ n’ụbọchi Tusedee bụ abali anọ nke ọnwa July.

Ego a ana ele anya ya site n’aka ndi mba so na otu a,ka ekwekọritara n’ọgbakọ nke iri abụọ na asaa nke were ọnọdu na ọnwa July afọ puku abụọ na iri na isii na  Kigali nke mba  Rwanda.

Mkpebi a ka amalitere itinye n’ọrụ na ọnwa January afọ puku abụọ n a iri na asaa,nke kwuru na mba ọbụla so na otua gana akwunye  ego n’eruhi otu pacenti site na ego nile ha nwerara na itubata ngwa ahia na akpa otua.

Kosinadi,otu AU n’achọ iji ego ndia akwado udo na mpaghara nile so na otua,nakwa iweta mmepe na ogige ha nile.

Otu AU nwere olilanya na ego ga enye aka maka igbo mkpa nile nakwa ihe anyi na ele anya ya n’afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ.

 

SHARE

LEAVE A REPLY