Otu Super Eagles ga etozu oke izọ iko mba Afrika nke afọ puku abụọ na iri na itolu ka Pinnick kwuru

0
26

Onye-isi otu egwu bọọlu akpọrọ Nigeria Football Federation n’olu bekee bụ  Amaju Pinnick ekwela nkwa na otu Eagles nke ala Naijiria ga etozu oke iso zọọ iko mba Afrika nke afọ puku abụọ na iri na itolu na Cameroon,na agbanyeghi na mba South Africa meriri ha na uyo.

Mba South Afrika gbara Naijiria ọkpụ abụọ na aggbata  Group E na Uyo, ebe Libya gbara Seychelles ọkpụ ise asatra nani otu na ụbọchi mbụ.

Pinnick gara n’ihụ kuo na ndi Super Eagles ga etozu oke iso zọọ iko mba uwa,nke ga were ọnọdu na mba.

“Ana m ekwe gi nkwa,na ọbụghi nani na anyi ga etozu oke iso sọọ iko mba Afrika kama anyi ga emeri ndi otu egwu Bafana na South Afrika,” Pinnick kwuru nkea mgbe ọna agwa ndi nta akụkọ okwu.

Otu Super Eagles kwesiri imeri egwuri egwu ise fọrọ na group E iji tozuo oke maka  AFCON na Cameroon.Ha bun di nke ato na agbata Group E.

Na iko mba uwa ga adi n’agbata Group B, Nigeria bụ ndi mbu ebe ha nwere akara isii,ebe ndi Cameroon bụ ndi nke abụọ nwere akara abụọ.

 

SHARE

LEAVE A REPLY