Sineti chọrọ ka ọkụ latrik kawanye nma n’mpaghara ugwu ala anyi

0
651

Ndi ụlọ nzukọ omiwu Sineti ekwuputala nsogbu ọna eweta bụ ndala azụ ọkụ latrik na mpaghara mgbago ugwu ala anyi,bụ nke mere ọtụtụ ụlọ mmeputa ngwa ahia jiri mechie.

Ha kwara ariri maka na emefuru ego di njeri kwuru njeri naira anọ na uma asaa bụ gọọmenti ala Naijiria iji bubata nmanụ patrol n’afọ puku abụọ na iri na isii.

Ma gaa n’ihu kwa ndi Cọmmitti n’ahu maka ọkụ,imeputa igwe na nmanụ gas ka ha leba anya na nsogbu ma wetara ha ozi nchọputa ha.

Ha nwere mkpebi a n’ụbọchi Tọọzdee mgbe ha nwere ọgbakọ,Mkpa ọdi bụ ichekwa Mega Watt(mw) di nari abụọ na iri na ise dina ogige ọkụ Kaduna”, onye kpalitere nkea bụ Sinator Bassey Albert Akpan.

Sinator Akpan bidoro kwuo na, “Ọ bụ maka enweghi okporo nmanụ gas si mpaghara ndida jee mgbago ugwu ala Naijiria mere anaghienweta ọkụ site na igwe ọkụ dina Kaduna”.

Sinator Akpan chọpụtara na gọọmenti site na ụlọ ọrọ NNPC n’aha ichafu na achọ inye ndi ọrụ ngo ọrụ ili okporo nmanụ ga esi Ajaokuta-Abuja-Kaduna ruo Kano.Ma kwuo mkpa ọdi bụ ime ka ogige ọkụ di na Kaduna malite ruwa ọrụ n’ime ọnwa isii,ka ndi mpaghara mgbago ugwu ala anyi rite uru dina ntintye etinyere 215 power plant n’olu bekee,mọbụ chọ ụzọ ọzọ aga esi enye ya nmanụ.

Senator Akpan, gara n’ihu kwuo na ndi Ministry n’ahụ maka ọkụ latrik,ọrụ na ụlọ obibi ekwenyeghi na iji nmanụ gas enye ogige ọkụ Kaduna ike.

Kama ,Ministry a si ka arụọ AGO tanks nke ji percenti iri isii karie ọnụ nke nmanụ gas.

Ya mere,ndi sineti ji si na ha ga enwe ọgbakọ ọzọ na abali anọ nke ọnwa July afọ puku abụọ na iri na asaa,iji zuo ike izu ụka abụọ.

 

SHARE

LEAVE A REPLY