Sineti ekwenyela n’nhọputa ndi Cọmishọna INEC di iri na ise

0
103

Ụlọ nzụkọ omiwu Sinate ekwenyela n’nhoputa mmadu iri na ise dika ndi Resident Electoral Commissioner,REC n’aha ichafu nke ndi ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission, INEC n’olu bekee.

Nkwenyere na nhoputa ndia gbakwasiri ukwu na ntule ndi Sinate cọmmittee n’ahu INEC,dika ha emechara nnyocha ndia ahọputara.

Na ime mmadu iri na ise ahọputara dika ndi Cọmmissiona,mmadu iri na abụọ bụ ndi ọhụrụ ebe mmadu atọ bụ ndi ochie.ndi ochie a akọghachiri gunyere; Hussaini Halilu Pai bụ onye n’anọchite anya Federal Capital Territory, Ahmed Makama bụ onye na anọchite anya Steti Bauch nakwa Sadiq Musa bụ onye na anọchite anya Steti Kaduna.

Ndi ohuru gunyere Umar Ibrahim (Steti Taraba ), Emeka Ononamadu Joseph (Steti Imo), Obo Effanga (Steti Cross River), James Apam, (Steti Benue),oka mmuta Godswill Obioma, (Abia) na oka mmuta  Francis Ezeonu (Steti Anambra).

Ndi ozo gunyere, Dr. Briyai Frankland (Setit Bayelsa), Ibrahim Abdullahi, mni (Steti Adamawa), Dr. Nentawe Yilwatda (Steti Plateau), Dr. Iloh Chuks, (Steti Enugu), Dr. Nwachukwu Orji (Steti Ebonyi)na Agboke Olaleke, (Steti Ogun State).

Senate Presidenti bu Dr. Bukola Saraki kwara ha ka ha tinye uchu na ọrụ ha,iji mee ka ntuli aka elu na ala Naijiria buru igba.

 

SHARE

LEAVE A REPLY