Steti Oyo n’akwado iwube odo ahia n’ala anyi

0
91

Aka n’achi Steti Oyo bụ Abiola Ajimobi ekwola na steti ya ga akwado Nigeria Investment Promotion Commission(NIPC)n’aha ichafu na mbọr ha na agba ikwado iwu ọdọ ahia na ala anyi country.

Ajimobi kwuru nkea na Ibadan mgbe ọnabatara ndi nnochite anya si ụlọ ọrụ  NIPC.

Ndi  nnochite anya ndi NIPC nke onye ndu ha bụ Yewande Sadiku,bukwa onye ode akwụkwọ ukwu na onye isi oche ụlọ ọrụ.

Ajimobi gara n’ihụ kwuo na Steti ya gana aga n’ihu akwado ụlọ ọrụ mgbe ọbụla ha chọrọ enyem aka,ma gbakwunye na Oyo nwere ihe nile achọrọ iji bụrụ ogige azụm ahia n’ala Naijiria.

O kwuru na ọchichi ya agbala mbọ ebe ọdi ukwu ime ka Steti a ka ọbụrụ ebe amara ama na mmeputa ngwa ahia n’ala anyi.

Anyi  eweputala ogige azum ahia n’efu nakwa ọdu ụgbọ ala na akụkụ ya iji kwalite iwube ogige ahia nke elewere anya ime ka Steti a bụrụ ama ama na azụ ahia n’ala anyi ka okwuru.

O kwuru na goomenti Steti enwetela nkwado oji ego achu ego si mba china,nke asaa n’ime ha amalitela oru na ogige azum ahia a.

Na mbido, Sadiku kwuru na NIPC mgbe n’adighi anya ga amalite nkuzi na“iwube ọdọ azụm ahia’’ iji kwado ndi opekata mpe.

O kwuru na nkuzi a lewere anya iji kwado ndi ala Naijiria ka ha wube odo ahia n’ala anyi.

 

 

SHARE

LEAVE A REPLY