Ụmụ agbọghọ di iri asato na abụọ enwerela onwe ha site n’aka ndi boko hara

0
81

Ụmụ agbọghọ ndi nwanyi di iri asatọ na abụọ nke si obodo Chibok bụ ndi nwere onwe ha site n’aka ndi boko haram, ka akpọlara Maiduguri bụ isi obodo Borno na ụbọchi ụka.

Emere ka ndi nta akụkọ mata nkea n’abali Satọdee,makwa na ụmụ agbọghọ a nwere onwe ha nọọ na Banki,obodo nọdebe  Borno,dika ahapuru ha na ehihie Satọdee.

Ụmụ agbọghọ a di iri asato na abụọ n’ọnụ ọgụgụ ka enyefere ndi n’etinye ọnụ maka ka ahapu ha bụkwa ndi ha gọọmenti etiti na arụko ihụ na ụmụ agbọghọ a lọghachiri,kamgbe atọrọ ha na ime ọnwa anọ nke afọ puku iri abụọ na anọ.

“Tupu akpọla ụmụ agbọghọ a edebere ha na ogige ndi agha ala anyi di na Maiduguri isi obodo Bornu,” dika onye agha si kwuo.

Enoch Mark bụ onye ụkọ-chukwu ma bụkwara onye ụmụ ya mmadu abụọ so na ndia atọrọ,kwuru n’ọ bụ otu onye n’ime ndi na eti mkpu ka akpọlata ụmụ agbọghọ a na Maiduguri mere ka ọ mata.

Ma gbakwunye nankea bụ ezigbo akụkọ nye anyi,otela anyi na echere ụbọchi di otua.Anyi nwere olilanya na aga ahapu ụmụ agbọghọ ndi fọrọ afọ.”

SHARE

LEAVE A REPLY