Usain Bolt ga agba ọsọ na Monaco

0
654

Onye na-agbara ndi Jamaica ọsọ bụ Usain Bolt ga agba ọsọ otu nari meter na ọgbakọ  Herculis EBS, na mba Monaco n’abali iri abụọ na otu nke ọnwa  July,izu ụka abụọ tupu osoro gba ọsọ iko mba ụwa na London.
ọ bụ ndi IAAF mere ka amata nkea na ụbọchi wes Wednesdee n’aka twitter ha.
Onye akara nturu ugo ọla-edo ugboro asatọ,bụ onye gbara ọsọ ikpeazu na obodo ya na mbido ọnwa a,bụ nke ikpeazu na ama egwuri egwu Louis II n’afọ puku abụọ na iri na otu.
Ndi nhazi ọgbakọ Herculis EBS mere ka amata na Usain Bolt ga eso izọ IAAF Diamond League nke ga adi n’abali abụọ na ọnwa July dika nke ọ ji ala a ezum ike nka,” Ndi isi IAAF kwuru nkea na ọba edemede website.
Bolt bụ onye ama ama,so goro zọọ iko mba ụwa ugboro iri na ise,ga agba nke ikeazu na ọnwa August n’isi obodo Britian.

SHARE

LEAVE A REPLY