Onye isi ndi NUJ adola ndi nta akuko aka na-nti

Tunde Akanbi, Ilorin

Adola otu jikoro ndi nta akuko bu Nigeria Union Journalist aka na nti ka ha hara imenyere onye obula mgbe ha na aru oru ha etu okwesiri.                                                                                                                 Onye isi oche ndi otu NUJ na stati kwara bu comrade Abiodun Abdulkareem doro aka na nti a na ubochi uka na Ilorin isi bu obodo stati Kwara mgbe ona agwa ndi nta akuko okwu.

Comrade Abdulkareem kwuru nka na ogbako ndi nta akuko,ma ga n’ihu kwa ndi nta akuko ka ha na aru oru ha nke oma ma gharakwa kwenyere onye obula.

Onye isi oche ngalaba NUJ a kwuru na otu ya na agbasi mbor ike ihu na ekpochapuru ndi adigboroja na stati a,ma doo ndi na eme ihe di otua aka na nti ka ha wepu aka enwe n’ofe maka odi nma nke ha;ma kwu na eguzobela otu ga eleba anya na oru ndi nta akuko adigboroja.                                                                                               Comrade Abdulkareem toro gomenti stati nke onye noo n’isi ya bu Governor Abdulfatah Ahmed bu onye okowara dika enyi ndi nta akuko site na irughari ma dozigharia ulo mgbasa ozi nke stati a.

Ogara n’íhu yoo gomenti ka oguzobe ogige nke nwere akorongwa agbara ohuru ma leta ndi oru mgbasa ozi anya etu okwesiri.

Onye isi oche NUJ a gosiputara nkwado ndi oru nta akuko na stati a, na nyocha nke na aga n’ihu nke gomenti na ahu maka ya,ma kwu na nkea ga eme ka gomenti mara onu ogugu ndi oru ma ka ewere ezi okwu mee nyocha a.

Comrade Abdulkareem kelere ndi nta akuko na stati a maka nkwado ha na enye  ndi ji okwa isi oche otua,ma kwe nkwa na ihe gbasara ihe ruru ndi oru ma nchekwa bu nke aga eleba anya.

Ma gbakwunye na ulo obibi ndi nta akuko,ulo akwukwo ebe ana azuputa ndi nta akuko bu International Institute of Journalists (IIJ)na pen house n’olu bekee bu eze ama na aga echi ma too nmekorita di na etiti ndi otu oru mgbasa ozi ndi dikaRATAWU, SWAN and NAWOJ.

Chidi.I